Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 43:33 - Bible Nso

33 Ha we nọdu n'iru ya, ọkpara dika ọnọdu-ọkpara-ya si di, nke-ntà kwa dika ọnọdu-nke-ntà-ya si di; ibobo we nwurita ndikom ahu n'aru n'etiti ibe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 43:33
5 Iomraidhean Croise  

Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.


Ọ we chọsie ike, n'okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n'akpa Benjamin.


Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya.


itinye aha ha n'elu otù nkume, aha nke umu Israel isī nke fọduru n'elu nkume nke-ọzọ, dika ọmumu nile ha si di.


Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n'eso ya n'azu, N'ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a n'aru onye ọ bula n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan