Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 43:30 - Bible Nso

30 Josef we me ngwa; n'ihi na obi-ebere-ya nile di ọku n'aru nwa-nne-ya: ọ chọ ebe ọ gākwa ákwá; o we ba n'ime-ulo-ya, kwa ákwá n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 43:30
16 Iomraidhean Croise  

O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha.


Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara.


Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya.


Nwayi ahu nke nwere nwa di ndu we si eze, (n'ihi na afọ chighariri ya n'aru nwa-ya,) o we si, Biko, onye-nwem, nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli. Ma nwayi nke-ọzọ nāsi, M'gaghi-enwe ya, i gaghi-enwe kwa ya; kpọwanu ya.


Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēsi aṅa rara gi nye, Efraim? M'gēsi aṅa nyebiga gi, Israel? M'gēsi aṅa me gi ka i di ka Adma? M'gēsi aṅa do gi ka Zeboim? obim ab͕aghariwo n'arum, obi-eberem nile di ọku n'otù.


otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:


N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie.


Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n'olu, sutu kwa ya ọnu,


N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus.


Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n'anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di,


Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;


n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù;


Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan