o rue, mb͕e ayi biara n'ebe inọ ọnọdu-abali, na ayi meghere akpa-ayi, ma, le, ego onye ọ bula di n'ọnu akpa-ya, bú ego-ayi n'ọtùtù-ya zuru okè; ayi ewe-ghachiwo ya n'aka-ayi.
Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata?