Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.
Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.