Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 43:11 - Bible Nso

11 Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n'ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ahụ nna ha Izrel gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-adịrịrị otu a, gịnị ọzọ ka anyị ga-eme. Kama mgbe unu na-aga, werenụ nʼakpa unu onyinye ịnata ihuọma nke bụ ihe niile kachasị mma nke si nʼala a welaara nwoke a. Werenụ nwantịntị mmanụ otite, na nwantịntị mmanụ aṅụ, ha na ụda dị iche iche, na eso osisi máá, na akụ, na alụmọnd.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 43:11
37 Iomraidhean Croise  

Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.


Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt.


n'ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n'ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia.


Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.


Ndikom ahu we were onyinye-inata-iru-ọma ahu, ọ bu kwa okpukpu ego abua ka ha were n'aka-ha, na Benjamin; ha bilie, rida n'Ijipt, guzo n'iru Josef.


Ha we dozie onyinye-inata-iru-ọma ahu rue ọbibia Josef n'etiti-ehihie: n'ihi na ha nuru na ọ bu n'ebe ahu ka ha gēri nri.


Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya.


nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala.


Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.


Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.


Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.


Ehaz we chiri ọla-ọcha na ọla-edo anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, zigara eze Asiria ka ọ buru ihe-iri-ngo.


Na mb͕e ahu Berodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: n'ihi na ọ nuru na Hezekaia riarárí ọria.


Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka?


Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.


N'ihi ulo uku Gi nime Jerusalem Ọ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.


Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.


Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu: Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe, Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.


Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.


Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.


Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe, Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.


Le ka ihu-n'anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem! Le ka ihu-n'anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine! Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile!


Manu nard na saffron, Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense; Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.


B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ, Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke uda di iche iche.


Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?


Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi.


Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.


Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.


Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ.


Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.


Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.


Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari.


Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n'ihi na achicha alapuwo n'ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n'aka-ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan