3 Umu-nne Josef iri we rida isi n'Ijipt zuta ọka.
3 Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka.
Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n'ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n'aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu.
Ọ si kwa, Le, anuwom na ọka di n'Ijipt: ridanu n'ebe ahu, si n'ebe ahu zutara ayi; ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu.
Ma Benjamin, bú nwa-nne Josef, ka Jekob nēzigaghi ka ya na umu-nne-ya yikọ je; n'ihi na ọ siri, Ka ajọ ihe we ghara idakwasi ya.
Umu Israel we bia izuru ọka n'etiti ndi nābia: n'ihi na oké unwu ahu di n'ala Kenean.