26 Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la.
26 ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.
ọ buru na ndi ziri ezi ka unu bu, ka eke otù nwa-nne-unu ab͕u n'ulo ebe anēdebe unu; ma unu onwe-unu, jenu, burunu ọka la n'ihi oké unwu nke ulo-unu:
ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a.
Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a.
Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n'ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n'ọnu akpa-ya.
Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?