Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 42:24 - Bible Nso

24 O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 42:24
15 Iomraidhean Croise  

O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile.


Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n'ihi na onye-nsughari nọ n'etiti ha.


Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.


Ọ si Udo diri unu, unu atula egwu: Chineke-unu, na Chineke nke nna-unu, enyewo unu àkù zoro ezo n'akpa-unu: ego-unu rurum aka. Ọ me ka Simeon pukute ha.


Josef we me ngwa; n'ihi na obi-ebere-ya nile di ọku n'aru nwa-nne-ya: ọ chọ ebe ọ gākwa ákwá; o we ba n'ime-ulo-ya, kwa ákwá n'ebe ahu.


Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya.


Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara.


Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,


Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá.


Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.


N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan