Jenesis 42:21 - Bible Nso21 Ha we sirita onwe-ha, N'ezie ndi ikpe maworo bayere nwa-nne-ayi ka ayi bu, n'ihi na ayi huru nkpab͕u nke nkpuru-obi-ya, mb͕e ọ nāriọ ayi aririọ-amara, ma ayi anughi; n'ihi ya ka nkpab͕u a biakwasiworo ayi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a21 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.” Faic an caibideil |
N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.