Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 42:19 - Bible Nso

19 ọ buru na ndi ziri ezi ka unu bu, ka eke otù nwa-nne-unu ab͕u n'ulo ebe anēdebe unu; ma unu onwe-unu, jenu, burunu ọka la n'ihi oké unwu nke ulo-unu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 42:19
13 Iomraidhean Croise  

Ọ we tiye ha n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, nime ulo-nkpọrọ, bú ebe Josef nọ n'ab͕u.


Oké unwu ahu we dikwasi n'elu uwa nile: Josef we meghe ebe nile nke ọka di nime ha, ọ we re ọka nye ndi Ijipt; oké unwu ahu we sie ike n'ala Ijipt.


Ayi nile, umu otù nwoke ka ayi bu, ndi ziri ezi ka ayi bu, ndi-orù-gi abughi ndi-nledo.


Josef we si ha n'ubọchi nke-atọ, Menu nka, di-kwa-nu ndu; n'ihi na Chineke ka mu onwem nātu egwu:


ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a.


Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la.


Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, we si ayi, Nime nka ka m'gāmara na ndi ziri ezi ka unu bu: kwenu ka otù nwa-nne-unu nọdu n'akam, ma werenu ọka n'ihi oké unwu nke ulo-unu, la:


O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ.


Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.


imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye-nkpọrọ si n'ebe emechibidoworo ya puta, ime ka ndi nānọdu n'ọchichiri si n'ulo-nkpọrọ puta.


Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan