Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 42:18 - Bible Nso

18 Josef we si ha n'ubọchi nke-atọ, Menu nka, di-kwa-nu ndu; n'ihi na Chineke ka mu onwem nātu egwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 42:18
12 Iomraidhean Croise  

Abraham we si, N'ihi na asirim, N'ezie ọ dighi egwù Chineke di n'ebe a; ha gēb͕ukwam n'ihi okwu bayere nwunyem.


ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke?


ọ buru na ndi ziri ezi ka unu bu, ka eke otù nwa-nne-unu ab͕u n'ulo ebe anēdebe unu; ma unu onwe-unu, jenu, burunu ọka la n'ihi oké unwu nke ulo-unu:


Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke.


M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?


Otù nwoke di n'ala Uz, Job bu aha-ya; nwoke ahu zuru okè, zi kwa ezi, ọ nātu kwa egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.


Ma ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, ha emeghi kwa dika eze Ijipt gwara ha, ma ha debere umu-ndikom ndu.


Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:


Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.


Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi.


si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu:


Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan