Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 42:15 - Bible Nso

15 nime nka ka agānwaputa unu: Fero di ndu! unu agaghi-esi n'ebe a pua ma-ọli, ma ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà abiaghi n'ebe a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 42:15
19 Iomraidhean Croise  

Ọ si ha, É-è, kama ọ bu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo ihu.


Josef we si ha, Nke ahu bu ihe m'gwara unu, si, Ndi-nledo ka unu bu:


Ziganu otù nime unu, ya kute nwa-nne-unu; ma unu onwe-unu, ka eke unu ab͕u, ka ewe nwaputa okwu nile unu, ma ezi-okwu di nime unu: ma ọ buru na ọ dighi otú a, Fero di ndu! ndi-nledo ka unu bu n'ezie.


ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a.


Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, kpayere ayi uka ike, tiye ayi n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ dika ndi-nledo ala.


ma menu ka nwa-nne-unu nke-ntà biakute m: ka m'mara kwa na ọ dighi ndi-nledo unu bu, kama unu bu ndi ziri ezi: nwa-nne-unu ka m'gēnye unu, ọ bu kwa n'ala nka ka unu gāzu ahia.


Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.


Juda we gwa ya okwu, si, Nwoke ahu b͕asiri ayi àmà ike, si, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na nwa-nne-unu esoghi unu bia.


ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n'ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia.


Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.


M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe.


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.


Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n'okpuru ikpé.


Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.


Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.


Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan