14 Josef we si ha, Nke ahu bu ihe m'gwara unu, si, Ndi-nledo ka unu bu:
14 Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu.
Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n'ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n'aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu.
nime nka ka agānwaputa unu: Fero di ndu! unu agaghi-esi n'ebe a pua ma-ọli, ma ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà abiaghi n'ebe a.
N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?
O me ka iwe-Ya di ọku imegidem, Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.