Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 41:6 - Bible Nso

6 Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 41:6
8 Iomraidhean Croise  

ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu:


O we raru ura rọ nrọ nke ub͕ò abua: ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha buru ibu di kwa nma.


Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ.


Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu.


Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.


Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.


Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan