Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 41:42 - Bible Nso

42 Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n'aka-ya, b͕aye ya n'aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n'olu-ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 41:42
27 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m'gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n'aka-gi nke di n'aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n'aka-ya.


me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n'iru ya, si, B͕u ikpere n'ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile.


N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.


Eze we si n'aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju.


Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.


O we de akwukwọ n'aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu:


Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.


Eze we wezuga nb͕a-aka-ya, nke o mere ka ọ ghara idi n'aka Heman, o we nye ya Mọdekai. Esta we do Mọdekai onye-isi ulo Heman.


Unu onwe-unu kwa, denu akwukwọ bayere ndi-Ju, dika o si di nma n'anya-unu, n'aha eze, were-kwa-nu nb͕a-aka-akàrà eze kà ya: n'ihi na odide-akwukwọ nke edeworo n'aha eze, nke ewerewo-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, ọ dighi onye puru ichighari ya.


N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu; Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.


N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi, Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.


Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.


Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.


Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa, Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.


I riwo obim, nwa-nnem nwayi; I werewo otù nime anya-gi abua, I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim.


na enyo-aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ikuku n'isi, na ákwà-nb͕ochi nile.


O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, o we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.


Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n'Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n'agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo.


Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi.


Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu.


Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.


Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:


Jonatan we yipu uwe-nwuda nke di n'aru ya, nye ya Devid, na uwe-ya nile, ọbuná rue mma-agha-ya, ru kwa uta-ya, ru kwa ihe-ike-n'úkwù-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan