O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n'ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n'ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n'ulo na n'ọhia.
Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.
N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.
Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon.
Mb͕e ahu Daniel nka ghọrọ ọkaka n'elu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze, n'ihi na mọ nke kachasi di nime ya; eze we zube ido ya onye-isi ala-eze-ya nile.