Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 41:34 - Bible Nso

34 Ka Fero me nka, me kwa ka ndi-nlekọta ala nka, ka ọ were kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ala Ijipt n'arọ asa ahu anēriju afọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 41:34
14 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, ka Fero leputa nwoke nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, ka o do kwa ya onye-isi ala Ijipt nile.


Ka ha chikọta kwa ihe-oriri nile nke ezi arọ ndia nke nābia, ka ha kwakọba kwa ọka n'okpuru aka Fero ibu ihe-oriri n'obodo Ijipt nile, ka ha debe kwa ya.


O gēru kwa, n'ọmume-ya, na unu gēnye Fero ọtù uzọ n'uzọ ise, uzọ anọ aburu kwa ihe unu nwere, ibu nkpuru-ọghigha nke ubi, na ibu ihe-oriri-unu, na iburu ndi nọ n'ulo-unu ihe-oriri, na iburu umu ntakiri-unu ihe-oriri.


Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n'uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere.


Ndikom ahu nālu ọlu n'ikwesi-ntukwasi-obi n'ozi ahu: ndi-nlekọta-ha bu kwa Jahat na Obadaia, ndi Livai, ndi sitere n'umu Merari; na Zekaraia na Meshulam, ndi sitere n'umu ndi Kohat, ibu ndi-isi: na ndi Livai ọzọ, bú ndi nile nwere nghọta n'ihe abù.


Joel nwa Zikri bu kwa onye nēlekọta ha: Juda nwa Hasenua bu kwa onye nke-abua n'ichi obodo ahu.


N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu; B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.


Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu.


Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.


Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.


Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia.


O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n'otù n'otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan