Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 41:16 - Bible Nso

16 Josef we za Fero, si, Ọ dighm n'aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 41:16
19 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem.


Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.


Fero we gwa Josef okwu, si, Na nrọm, le, m'nēguzo n'usọ osimiri Nail:


Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.


Nke ahu bu okwu nke m'gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya.


Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m'gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n'ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine?


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


Ihe-iriba-ama nile na ihe-iju-anya nile nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu meworo n'imesom, ọ dim nma n'anya ikọ akukọ ha.


O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.


Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.


si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi.


Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije?


O we jide ya n'aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume.


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;


Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan