Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 40:8 - Bible Nso

8 Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 40:8
17 Iomraidhean Croise  

Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n'irum.


Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.


Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya, Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri, Igosi madu izi-ezi-ya;


Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.


Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?


Ajuju a nke eze nāju di ike, ọ dighi kwa onye ọzọ nke gākọ ya n'iru eze, ma-ọbughi nání chi-ayi, ndi ebe-obibi-ha nādighi n'etiti anu-aru, bú madu.


Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;


ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:


Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


Ma n'ikpe-azu Daniel batara n'irum, onye aha-ya bu Belteshaza, dika aha chim si di, onye mọ nke chi nsọ nile di kwa nime ya: ọ bu kwa n'iru ya ka m'zere nrọ ahu, si,


Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi.


N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan