Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 40:20 - Bible Nso

20 O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 40:20
14 Iomraidhean Croise  

Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.


ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya.


ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.


Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;


n'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n'iru ya:


Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.


Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o weliri isi Jehoiakin, bú eze Juda, me ka o si n'ulo-nkpọrọ puta;


Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ.


Ma mb͕e ogologo oge gasiri onye-nwe ndi-orù ahu bia, ya na ha we piazi.


Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan