Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 4:16 - Bible Nso

16 Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 4:16
19 Iomraidhean Croise  

Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n'ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n'ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n'iru Jehova, bú Chineke, n'etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige.


Le, I chupuwom ta n'iru ala; ọ bu kwa n'iru-Gi ka agēzopum; m'gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n'uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um.


Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.


Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n'aru ha, che ha iru, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n'iru Ya chupu ha rue ub͕u a.


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua.


Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya.


Ọ gaghi-ele miri-iyi anya, Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.


Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi.


Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha: Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku, Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì.


Ndi Israel nile we nāhu éb͕è-elu-igwe nile, na ire-ọku nile, na olu opì-ike ahu, na ugwu ahu ka ọ nākwu anwurù: mb͕e ndi ahu huru ya ha we ṅaghari, guzo n'ebe di anya.


n'ihi nka, le, Mu onwem, M'gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n'irum:


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova.


N'ihi na ebe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aham, n'ebe ahu ka M'nọ n'etiti ha.


mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi;


Ọ nọri n'uwa, ekèkwara uwa site n'aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya.


Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.


N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan