Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya.
Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua.