27 O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n'afọ-ya.
27 Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya.
O rue, n'ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta.