Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 38:26 - Bible Nso

26 Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 38:26
19 Iomraidhean Croise  

Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n'ezie.


O we chipu n'aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n'onu-uzọ Enaim, nke di n'uzọ Timna; n'ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye.


Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n'iye-aka Jehova.


Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n'elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n'anya Israel nile.


Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n'ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru.


Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam.


Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi; Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.


Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.


Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.


Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;


Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu;


Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:


Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.


Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan