ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna:
Ma otù nwoke bi na Maon, nke ọlu ọ nālu di na Kamel; nwoke ahu di kwa nọ̄ uku, ọ nwe-kwa-ra nnù aturu asa na ọgu iri, na nnù ewu abua na ọgu iri: ọ we nọ n'ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya na Kamel.