Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 38:1 - Bible Nso

1 O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 38:1
12 Iomraidhean Croise  

Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu.


Juda we zìe nwa-ewu ahu n'aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n'aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya.


Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.


Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n'ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n'ebe ahu iri nri.


Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.


Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.


Ọzọ, onye-nnweta ka M'gēme ka ọ biakute gi, gi nwanyi bi na Maresha: rue Adulam ka nsọpuru Israel gābia.


eze Libna, otù; eze Adulam, otù;


na Jamut, na Adulam, na Soko, na Azeba;


Jael we pua izute Sisera, si ya, Wezuga onwe-gi, onye-nwem, wezuga onwe-gi bakutem; atula egwu. O we wezuga onwe-ya bakuru ya n'ulo-ikwū, o were ákwà-ichu-oyi kpuchie ya.


Devid we si n'ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan