Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:9 - Bible Nso

9 Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:9
19 Iomraidhean Croise  

Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru.


Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n'ezie ikpọ isi ala nye gi?


ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem.


Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n'ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n'ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n'ihi nrọ-ya nile, na n'ihi okwu-ya nile.


Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.


Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n'ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n'ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya.


Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.


Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya.


Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n'udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala.


Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya.


Onye-nwem juru ndi-orù-ya, si, Ùnu nwere nna ma-ọbu nwa-nne?


Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ:


Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya.


Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.


O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n'ala, o we zọda ha ukwu.


Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.


ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan