ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem.
Juda we biakute ya nso, si, Biko, onye-nwe m, biko, ka orù-gi kwue okwu na nti onye-nwe m, iwe-gi adi-kwa-la ọku n'aru orù-gi: n'ihi na otú i di, otú ahu ka Fero di kwa.