Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:35 - Bible Nso

35 Umu-ya ndikom nile na umu-ya ndinyom nile we bilie ikasi ya obi; ma ọ juru, na agaghi-akasi ya obi; ọ si, N'ihi na m'gāridakuru nwam rue ala-mọ nēru újú. Nna-ya we kwara ya ákwá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:35
18 Iomraidhean Croise  

Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.


Leban we za, si Jekob, Umu-ndinyom ndia bu umu-ndinyom nkem, umu-ndikom ndia bu kwa umu-ndikom nkem, ìgwè ewu na aturu ndia bu kwa ìgwè ewu na aturu nkem, ihe ọ bula kwa gi onwe-gi nāhu, nkem ka ọ bu: ma umum ndinyom, gini ka m'gēmere ndia ta, gini ka m'gēme-kwa-ra umu-ha ndikom ndi ha mutara?


Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.


Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo:


Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.


Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m'je, hu ya anya tutu mu anwua.


Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi.


Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.


Ma ub͕u a ọ nwuwo, n'ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem.


Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú.


Efraim, bú nna-ha, we rue újú ọtutu ubọchi, umu-nne-ya we bia ikasi ya obi.


Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi.


N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya.


M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku: M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n'ihi na ha adighi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan