Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:33 - Bible Nso

33 Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n'ezie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:33
10 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu.


ziga uwe-nwuda ahu nwere aka, chita ya nye nna-ha, si, Nka ka ayi hutaworo: biko, mata ma uwe nwa-gi ka ọ bu ma-ọbu na ọ bughi ya.


Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.


Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya.


otù nime ha we si n'ebe m'nọ pua, m'we si, N'ezie anu-ọhia adọb͕usiwo ya; ahughi-kwam ya rue ub͕u a:


Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi.


Ọ we la, ọdum we huta ya n'uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n'uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n'akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n'akuku ozu ahu.


Ọ le anya n'azu-ya, hu ha, kọcha ha n'aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n'oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n'etiti ha.


Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula: Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.


Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan