Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:28 - Bible Nso

28 Ndi Midian, bú ndi-ahia, we gabiga; ha we sere Josef, si n'olùlù dọlite ya, re Josef nye ndi Ishmael n'orú nkpuru-ego ọla-ọcha. Ha we kubata Josef n'Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:28
25 Iomraidhean Croise  

Ọ muara ya Zimram, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua.


Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt.


Ndi Midian we rerue ya Ijipt nye Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū.


Ma emere ka Josef ridata n'Ijipt: Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū, bú nwoke Ijipt, we b͕a ya n'aka ndi Ishmael, ndi mere ya ka ọ ridata n'ebe ahu.


n'ihi na ezupurum n'ala ndi-Hibru n'ezie: ọzọ kwa, n'ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n'olùlù a.


Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n'ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya.


O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù:


Me ha otú I mere Midian; Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:


Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua.


Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.


Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto Jehova ka ha gēzisa.


Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n'olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche ahu.


Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara arọ ise we rue onye b͕ara orú arọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa orú shekel, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.


Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.


Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha:


si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya.


Mb͕e ahu okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya;


Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya,


Ndikom Israel we si Gideon, Nāchi ayi, ma gi onwe-gi, ma nwa-gi nwoke, ma nwa nwa-gi: n'ihi na i zọputawo ayi n'aka Midian.


Gideon we si ha, Ka m'riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N'ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n'ihi na ndi Ishmael ka ha bu.)


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan