Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:20 - Bible Nso

20 Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:20
25 Iomraidhean Croise  

Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia.


Juda we si umu-nne-ya, Ùrù gini di ya mb͕e ayi gēb͕u nwa-nne-ayi, zo ọbara-ya?


ziga uwe-nwuda ahu nwere aka, chita ya nye nna-ha, si, Nka ka ayi hutaworo: biko, mata ma uwe nwa-gi ka ọ bu ma-ọbu na ọ bughi ya.


Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n'ezie.


Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n'ihi na ha mara jijiji n'iru ya.


Ọ we la, ọdum we huta ya n'uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n'uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n'akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n'akuku ozu ahu.


Ọ le anya n'azu-ya, hu ha, kọcha ha n'aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n'oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n'etiti ha.


Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha?


Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà, Ekwela.


N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.


Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha; Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.


Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa; Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;


N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:


Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe?


N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.


Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n'aka-gi.


Sọl we bilie, rida rue ọzara Zif, ya na nnù ndikom asa na ọgu iri, ndi arọputara nke Israel, ichọ Devid n'ọzara Zif.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan