Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:18 - Bible Nso

18 Ha we hu ya n'ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:18
19 Iomraidhean Croise  

Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem.


Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia.


Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n'ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya.


Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu.


Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.


N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem: Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.


N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum.


Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova: Asiwom, Chinekem ka I bu.


Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.


Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche, Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.


Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume, Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.


Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya.


Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua:


Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi.


Ma ememe ngabiga na achicha ekoghi-eko gādi mb͕e ubọchi abua gasiri: ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi jide Ya n'aghughọ, b͕ue Ya:


Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.


Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl.


Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan