Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:15 - Bible Nso

15 Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n'ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:15
10 Iomraidhean Croise  

Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.


Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem.


Ọ si Umu-nnem ka m'nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu.


Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m'gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria.


Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi?


Ya mere Jisus, ebe Ọ matara ihe nile nābiakwasi Ya, Ọ pua, si ha, Ònye ka unu nāchọ?


Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret.


Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.


Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu?


Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m'gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n'akuku egedege-iru-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan