na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.
na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n'aka-ha, iwebata ya n'ulo Jehova.