Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 37:11 - Bible Nso

11 Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 37:11
20 Iomraidhean Croise  

O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n'ìhi gini ka i nēguzo n'èzí? n'ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ.


Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem.


Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.


Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.


Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ekworo nke Efraim gēwezuga kwa onwe-ya, agēbipu kwa ndi nākpab͕u Juda: Efraim agaghi-ekwoso Juda ekworo, Juda agaghi-akpab͕u kwa Efraim.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.


N'ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.


N'ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.


Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya.


O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya.


Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n'ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha.


Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya,


ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.


N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.


Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi?


Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan