Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha.
Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.
unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta.