Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 35:7 - Bible Nso

7 O wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n'iru nwa-nne-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 35:7
16 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Ọ we si n'ebe ahu kwapu je ugwu ahu di n'Iru-anyanwu Bet-el, ọ ma ulo-ikwū-ya, Bet-el di n'Ọdida-anyanwu, Ai di n'Iru-anyanwu: o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova.


Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran.


Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;


Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe.


Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.


nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.


Jekob we zọlie ukwu-ya, jerue ala umu Iru-anyanwu.


Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.


Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi.


Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el.


ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere.


Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi:


Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.


Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan