25 umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali:
25 Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ, Dan na Naftalị.
Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.
Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha.
Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.
Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.
Gilead biri n'ofè Jọdan: Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o? Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri, Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.
Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu, Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.