Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 35:23 - Bible Nso

23 umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ụmụ Lịa bụ, Ruben, ọkpara Jekọb. Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 35:23
33 Iomraidhean Croise  

Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel.


Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.


Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha.


Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem; Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.


Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise.


Ndi-isi kwa nke ebo nile nke Israel: nke ndi Reuben, Elieza nwa Zikri bu onye-ndú: nke ndi Simeon, Shefataia nwa Meaka:


Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n'Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya.


Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù:


Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua.


Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.


Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua.


Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku. Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu bu ndi nke ọkọlọtọ ọmuma-ulo-i kwū Juda, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: onye-isi umu Juda nwere bu Nahshon nwa Aminadab.


Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu:


Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.


Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n'ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda:


O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.


Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si,


Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu; Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.


Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.


Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.


Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda.


Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid:


Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di.


Site n'ebo Simeon orù nnù na nnù iri: Site n'ebo Livai orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Isaka orú nnù na nnù iri:


Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida; Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi. Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida, Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.


Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora; Dika Isaka si di, otú a ka Berak di; Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua. Na miri-iyi nile nke Reuben Ka oké nzube obi di.


Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu, Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.


Ndi nile ndi nọ n>ọnu-uzọ-ama na ndi-okenye we si, Ndi-#am#a ka ayi bu. Jehova me nwayi a nke n=ab#a n>ulo-gi ka ọ di ka Rechel na dika Lea, ndi ha abua wuru ulo Israel: gi me kwa d#inkp#a n>Efrata, me ka amara aha-gi na Bet-lehem:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan