Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 34:19 - Bible Nso

19 Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n'ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 34:19
15 Iomraidhean Croise  

Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.


Okwu-ha nile we di nma n'anya Hemoa, na n'anya Shekem, bú nwa Hemoa.


Hemoa na Shekem nwa-ya we bia n'ọnu-uzọ-ama obodo-ha, gwa ndikom obodo-ha okwu, si,


ehi ahu ndi tara aru, ndi, jọkwara njọ, we rie ehi asa mbu mara abuba:


Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.


Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u.


Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi: N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu; Ekworo siri ike dika ala-mọ: Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku, Ire-ọku nke Ja onwe-ya.


N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.


Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.


Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu.


Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha.


Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom.


Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n'etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n'ulo-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan