Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?
Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n'ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n'umu-ndinyom Kenean;
Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ
Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n'ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n'ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu.