Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 33:3 - Bible Nso

3 Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 33:3
12 Iomraidhean Croise  

o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,


Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha.


Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.


Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya.


Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala.


Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi, N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi; Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.


Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n'ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum.


Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya.


Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri; Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu: Ebe nwanyi àgà muworo umu asa; Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan