Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 33:14 - Bible Nso

14 Biko, ka onye-nwem gabiga n'iru orù-ya: ma mu onwem, ka m'nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n'irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m'gābiakute onye-nwem rue Sia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 33:14
13 Iomraidhean Croise  

Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.


Ọ nye ha iwu, si Otú a ka unu gāsi onye-nwem Isọ; Otú a ka orù-gi Jekob siri, N'ulo Leban ka m'nọworo dika ọbìa, nọgide rue ub͕u a:


Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n'akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa,


Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;


Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;


O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya:


Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.


Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n'ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi;


Ayi we che iru, bulie ije ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi.


Jehova, mb͕e I siri na Sia puta, Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije, Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri, Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan