Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 33:10 - Bible Nso

10 Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 33:10
19 Iomraidhean Croise  

biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua:


Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.


Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.


Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere.


Juda we gwa ya okwu, si, Nwoke ahu b͕asiri ayi àmà ike, si, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na nwa-nne-unu esoghi unu bia.


Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt:


Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si.


Eze we si, Ka o chigharia la n'ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n'ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.


Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze.


Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n'ebe a, ka m'ziga kwa gi jekuru eze, si N'ìhi gini ka m'siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n'ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m'hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m'nwua.


Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n'aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum.


Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya.


Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ, N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum.


Otú a ka Jehova siri, Ndi siri na mma-agha fọdu hutara amara n'ọzara; mb͕e M'jere ime ka o nwe ọnọdu, bú Israel.


Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.


ha gāhu kwa iru-Ya; aha-Ya gādi kwa n'egedege-iru-ha.


Rut we da kpue iru-ya n>ala, kpọ isi ala, si ya, Gini mere m>hutaworo amara n>iru gi, i we matam, ebe mu onwem bu ọb#ia?


Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan