Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 32:29 - Bible Nso

29 Jekob we jua ya, si Biko, gosim aha-gi. Ọ si N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham? Ọ gọzie ya n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 32:29
18 Iomraidhean Croise  

Agaghi-akpọ kwa aha-gi Abram ọzọ, ma aha-gi gābu Abraham; n'ihi na nna nke ìgwè mba ka M'meworo gi.


Chineke we si ya, Aha-gi bu Jekob: agaghi-akpọ aha-gi Jekob ọzọ, kama Israel gābu aha-gi: Ọ we kpọ aha-ya Israel.


Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram bia, Ọ gọzie ya.


Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi.


Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel;


Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.


Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke? Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?


Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?


N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.


Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.


Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:


Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia.


Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan