Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 32:26 - Bible Nso

26 Ọ si Gham ka m'la, n'ihi na chi nābọ. Ọ si, M'gaghi-agha gi ka i la, ma ọ buru na i gọzighim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 32:26
19 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ọ huru na ọ pughi ijide ya, o metu isi-ọsu-ya; isi-ọsu Jekob we pua n'ọnọdu-ya, mb͕e ya na ya nab͕a nb͕a.


Ọ si ya, Gini bu aha-gi? Ọ si, Jekob.


Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.


Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah


ma ub͕u a kwe ka M'nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M'we me kwa ka ha gwusia; M'gēme kwa gi ka i buru mba uku.


Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga, Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Ejiderem ya, arakwaghm ya aka, Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem, Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.


Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel, Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo; Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.


Otú a ka Jehova siri, bú Onye Nsọ nke Israel na Onye kpuworo ya: Juanum ajuju bayere ihe nile nābia; nyenum iwu bayere umum, ma-ọbu bayere ọlu akam abua.


Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi.


o we jisie ike n'aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka;


É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.


Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.


ram aka, ka M'we kpochapu ha, hichapu kwa aha-ha n'okpuru elu-igwe: M'gēme kwa gi ka i buru mba di ike ba kwa uba kari ha.


Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan