23 O we chiri ha, me ka ha gabiga miri-iyi ahu, me kwa ka ihe o nwere gabiga.
23 Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
Ọ we bilie n'abali ahu, chiri nwunye-ya abua, na ndinyom abua nējere ya ozi, na umu-ya iri na otù, gabiga ngabiga-miri Jakob.
O we fọdu Jekob nání ya; otú nwoke we so ya nāb͕a nb͕a rue chi-ọbubọ.