Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 32:2 - Bible Nso

2 mb͕e ọ huru ha Jekob siri, Ọmuma-ulo-ikwū Chineke ka nka bu: ọ we kpọ aha ebe ahu Mahanaim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 32:2
17 Iomraidhean Croise  

Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.


Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon.


Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim;


Ma, le, ọ di n'aka-gi, bú Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke Bahurim, onye ya onwe-ya kọcharam nkọcha jọb͕uru onwe-ya n'ubọchi m'jere Mahanaim: ma ya onwe-ya ridara izutem na Jọdan, m'we were Jehova ṅuara ya iyi, si, M'gaghi-ewere mma-agha me ka i nwua ma-ọli.


Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim:


Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n'inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.


N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.


Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.


Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.


Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a? Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya onwe-ya bu Eze ebube a. Selah


Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha.


Lata, lata, gi nwanyi Shulam; Lata, lata, ka ayi we lekwasi gi anya. Gini mere unu gēji lekwasi nwanyi Shulam anya, Dika ilekwasi otite-egwú nke Mahanaim?


O we si, Ì mara ihe m'jiri biakute gi? ma ub͕u a m'gālaghachi ibuso onye-isi Peasia agha: ma mb͕e mu onwem nāpu, le, onye-isi Jevan gābata.


Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si,


Site n'ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile;


Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m'biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan