Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:5 - Bible Nso

5 ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:5
15 Iomraidhean Croise  

O rue na mb͕e ahu, na Abimelek na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, gwara Abraham okwu, si, Chineke nọyere gi n'ihe nile nke gi onwe-gi nēme:


Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.


Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;


Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya.


Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.


Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.


Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di,


Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.


Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi.


Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma:


Ọ we gọzie Josef, si, Chineke ahu, Nke nnam-hà, bú Abraham na Aisak, nējeghari n'iru Ya, Chineke ahu Nke nāzùm ogologo ogem rue taa,


Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n'ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu.


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan